Diuteronomi 2:27
Deuteronomy 2:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
Deuteronomy 2:27 in English
Deuteronomy 2:27 · Berean Standard Bible
“Let us pass through your land; we will stay on the main road. We will not turn to the right or to the left.
Context
25Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.” 26Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị, 27“Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 28Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala, 29dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.