Native Bible

Deuteronomy 2:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị,

Deuteronomy 2:26 in English

Deuteronomy 2:26 · Berean Standard Bible

So from the Wilderness of Kedemoth I sent messengers with an offer of peace to Sihon king of Heshbon, saying,

Context

24Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu. 25Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.” 26Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị, 27“Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 28Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.