Diuteronomi 2:29
Deuteronomy 2:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
Deuteronomy 2:29 in English
Deuteronomy 2:29 · Berean Standard Bible
just as the descendants of Esau who live in Seir and the Moabites who live in Ar did for us, until we cross the Jordan into the land that the LORD our God is giving us.”
Context
27“Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 28Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala, 29dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.” 30Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a. 31Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.