Diuteronomi 15:21
Deuteronomy 15:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị.
Deuteronomy 15:21 in English
Deuteronomy 15:21 · Berean Standard Bible
But if an animal has a defect, is lame or blind, or has any serious flaw, you must not sacrifice it to the LORD your God.
Context
19Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị. 20Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara. 21Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị. 22Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada. 23Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.
15:3 Ndị ọbịa kwesiri ịkwụ ụgwọ a, nʼihi na ha adịghị eso ụmụ Izrel na-ahapụ ala ha ka o zuo ike nye Onyenwe anyị, mgbe afọ asaa ruru. Ya mere, ha nwere ego ịkwụ ụgwọ ha ji. Lev 25:1-7
15:17 Ịkpọpu ntị bụ akara e ji amara onye bụ ohu na mgbe ochie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.