Native Bible

Deuteronomy 15:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị.

Deuteronomy 15:1 in English

Deuteronomy 15:1 · Berean Standard Bible

At the end of every seven years you must cancel debts.

Context

1Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị. 2Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola. 3Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ,* ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.