Native Bible

Deuteronomy 15:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ,* ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.

Deuteronomy 15:3 in English

Deuteronomy 15:3 · Berean Standard Bible

You may collect something from a foreigner, but you must forgive whatever your brother owes you.

Context

1Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị. 2Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola. 3Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ,* ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị. 4Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu, 5ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.