Native Bible

Deuteronomy 14:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa,

Deuteronomy 14:9 in English

Deuteronomy 14:9 · Berean Standard Bible

Of all the creatures that live in the water, you may eat anything with fins and scales,

Context

7Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu. 8Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha. 9Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa, 10ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ. 11Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.