Diuteronomi 11:31
Deuteronomy 11:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya,
Deuteronomy 11:31 in English
Deuteronomy 11:31 · Berean Standard Bible
For you are about to cross the Jordan to enter and possess the land that the LORD your God is giving you. When you take possession of it and settle in it,
Context
29Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu. 30Gerizim na Ebal bụ ugwu dị nʼofe Jọdan, nʼakụkụ okporoụzọ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dị nso nʼebe osisi ukwu ndị ahụ toro na More, nʼala ndị Kenan ahụ bi nʼAraba, nʼakụkụ Gilgal. 31Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya, 32hụnụ na unu rubere isi debe iwu niile na ụkpụrụ niile m na-eche nʼihu unu taa.
11:10 Nke a bụ nʼala ebe ihe ọkụkụ na-adịghị eto ma a gbaghị ya mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.