Diuteronomi 11:29
Deuteronomy 11:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu.
Deuteronomy 11:29 in English
Deuteronomy 11:29 · Berean Standard Bible
When the LORD your God brings you into the land you are entering to possess, you are to proclaim the blessing on Mount Gerizim and the curse on Mount Ebal.
Context
27Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa. 28Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke Onyenwe anyị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị. 29Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu. 30Gerizim na Ebal bụ ugwu dị nʼofe Jọdan, nʼakụkụ okporoụzọ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dị nso nʼebe osisi ukwu ndị ahụ toro na More, nʼala ndị Kenan ahụ bi nʼAraba, nʼakụkụ Gilgal. 31Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.