Diuteronomi 11:27
Deuteronomy 11:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa.
Deuteronomy 11:27 in English
Deuteronomy 11:27 · Berean Standard Bible
a blessing if you obey the commandments of the LORD your God that I am giving you today,
Context
25Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa. 26Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị Onyenwe anyị na ọbụbụ ọnụ. 27Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa. 28Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke Onyenwe anyị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị. 29Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.