Native Bible

Deuteronomy 1:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị.

Deuteronomy 1:45 in English

Deuteronomy 1:45 · Berean Standard Bible

And you returned and wept before the LORD, but He would not listen to your voice or give ear to you.

Context

43Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu. 44Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa. 45Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị. 46Nʼihi ya, unu nọrọ ọtụtụ oge na Kadesh. 1:1 Nke a bụ nʼofe Jọdan 1:2 Ugwu Horeb Aha ọzọ a na-akpọ ugwu Horeb bụ ugwu Saịnaị. 1:21 Jos 1:6,9 1:23 Ọnụ 13:2-3 1:28 Ụmụ Anak Ụmụ Anak bụ ndị bi nʼala Kenan. Ha bụ ndị a kọwara dịka ndị gbara nnọọ dimkpa, topụkwa etopụ. Ọnụ 13:28 1:30 Ọpụ 14:14; Dit 3:22; 20:4; Neh 4:20

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.