Native Bible

Deuteronomy 1:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu.

Deuteronomy 1:43 in English

Deuteronomy 1:43 · Berean Standard Bible

So I spoke to you, but you would not listen. You rebelled against the command of the LORD and presumptuously went up into the hill country.

Context

41Mgbe ahụ, unu kwupụtara mmehie unu sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị. Anyị ga-agbago nʼala ahụ gaa lụọ ọgụ, dịka Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị nʼiwu.” Ya mere, onye ọbụla nʼime unu yikwasịrị ihe agha ya na-eche na ọ dị mfe ịgbago nʼobodo ndị ahụ dị nʼugwu. 42Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gwa ha, ‘Unu arịgokwala, gaa buo agha, nʼihi na agaghị m anọnyere unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.’ ” 43Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu. 44Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa. 45Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.