Diuteronomi 1:38
Deuteronomy 1:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha.
Deuteronomy 1:38 in English
Deuteronomy 1:38 · Berean Standard Bible
Joshua son of Nun, who stands before you, will enter it. Encourage him, for he will enable Israel to inherit the land.
Context
36karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.” 37Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ! 38Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha. 39Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa. 40Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.