Diuteronomi 1:39
Deuteronomy 1:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa.
Deuteronomy 1:39 in English
Deuteronomy 1:39 · Berean Standard Bible
And the little ones you said would become captives—your children who on that day did not know good from evil—will enter the land that I will give them, and they will possess it.
Context
37Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ! 38Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha. 39Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa. 40Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.” 41Mgbe ahụ, unu kwupụtara mmehie unu sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị. Anyị ga-agbago nʼala ahụ gaa lụọ ọgụ, dịka Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị nʼiwu.” Ya mere, onye ọbụla nʼime unu yikwasịrị ihe agha ya na-eche na ọ dị mfe ịgbago nʼobodo ndị ahụ dị nʼugwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.