Native Bible

Deuteronomy 1:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”

Deuteronomy 1:36 in English

Deuteronomy 1:36 · Berean Standard Bible

except Caleb son of Jephunneh. He will see it, and I will give him and his descendants the land on which he has set foot, because he followed the LORD wholeheartedly.”

Context

34Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị, 35“O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu, 36karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.” 37Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ! 38Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.