Daniel 8:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.
Daniel 8:3 in English
Daniel 8:3 · Berean Standard Bible
Then I lifted up my eyes and saw a ram with two horns standing beside the canal. The horns were long, but one was longer than the other, and the longer one grew up later.
Context
1Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ. 2Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai. 3Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ. 4Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu. 5Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.