Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya.

Daniel 8:5 in English

Daniel 8:5 · Berean Standard Bible

As I was contemplating all this, suddenly a goat with a prominent horn between his eyes came out of the west, crossing the surface of the entire earth without touching the ground.

Context

3Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ. 4Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu. 5Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya. 6Ọ bịaruru nso ebule ahụ nwere mpi abụọ nke m hụrụ guzo nʼakụkụ mmiri, were oke iwe na-agbata ọsọ nʼebe ọ nọ. 7Ahụrụ m ka o ji oke iwe lụso ebule ahụ ọgụ kujipụ mpi abụọ ya. Ebule ahụ enweghị ike iguzogide ya. Ọ tụdara ya nʼala, were ụkwụ ya zọda ya, ma na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịnapụta ebule ahụ site nʼike ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.