Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai.

Daniel 8:2 in English

Daniel 8:2 · Berean Standard Bible

And in the vision I saw myself in the citadel of Susa, in the province of Elam. I saw in the vision that I was beside the Ulai Canal.

Context

1Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ. 2Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai. 3Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ. 4Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.