Daniel 4:36
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga.
Daniel 4:36 in English
Daniel 4:36 · Berean Standard Bible
At the same time my sanity was restored, my honor and splendor returned to me for the glory of my kingdom. My advisers and nobles sought me out, and I was restored to my throne, and surpassing greatness was added to me.
Context
34Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.
Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ,
onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 35Mmadụ niile bi nʼụwa
bụ ihe efu nʼihu ya.
Nʼihi na ọ na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ
nʼetiti usuu ndị bi nʼeluigwe,
na nʼetiti ndị bi nʼụwa.
O nweghị onye pụrụ igbochi ya,
maọbụ onye pụrụ ịjụ ya sị ya, “Gịnị mere iji mee ihe ndị a?” 36Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga. 37Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.
4:7 Ezeere m ha nrọ ahụ
4:10 Maọbụ, ịdị elu ya
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.