Daniel 4:37
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ. 4:7 Ezeere m ha nrọ ahụ 4:10 Maọbụ, ịdị elu ya
Daniel 4:37 in English
Daniel 4:37 · Berean Standard Bible
Now I, Nebuchadnezzar, praise and exalt and glorify the King of heaven, for all His works are true and all His ways are just. And He is able to humble those who walk in pride.
Context
35Mmadụ niile bi nʼụwa
bụ ihe efu nʼihu ya.
Nʼihi na ọ na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ
nʼetiti usuu ndị bi nʼeluigwe,
na nʼetiti ndị bi nʼụwa.
O nweghị onye pụrụ igbochi ya,
maọbụ onye pụrụ ịjụ ya sị ya, “Gịnị mere iji mee ihe ndị a?” 36Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga. 37Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.
4:7 Ezeere m ha nrọ ahụ
4:10 Maọbụ, ịdị elu ya
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.