Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Daniel 4:34 in English

Daniel 4:34 · Berean Standard Bible

But at the end of those days I, Nebuchadnezzar, looked up to heaven, and my sanity was restored to me. Then I praised the Most High, and I honored and glorified Him who lives forever: “For His dominion is an everlasting dominion, and His kingdom endures from generation to generation.

Context

32A ga-esi nʼetiti ndị mmadụ chụpụ gị, ka ị gaa soro ụmụ anụmanụ biri nʼọhịa. Ị ga-atakwa ahịhịa dịka oke ehi, afọ asaa ga-agasị tutu ruo mgbe ị ghọtara na ọ bụ Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze dị niile nke ụwa. Ọ na-enyefekwa ha nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ chịa.” 33Nʼotu oge ahụ kwa, okwu ndị a e kwuru banyere Nebukadneza mezuru. E sitere nʼetiti ụmụ mmadụ chụpụ ya, ọ gakwara nʼọhịa taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ ya ruo mgbe ajị dị ya nʼahụ toro ogologo dịka nku ugo, mbọ ụkwụ na aka ya dịkwa ka mbọ ụmụ nnụnụ. 34Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 35Mmadụ niile bi nʼụwa bụ ihe efu nʼihu ya. Nʼihi na ọ na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ nʼetiti usuu ndị bi nʼeluigwe, na nʼetiti ndị bi nʼụwa. O nweghị onye pụrụ igbochi ya, maọbụ onye pụrụ ịjụ ya sị ya, “Gịnị mere iji mee ihe ndị a?” 36Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.