Daniel 3:27
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha.
Daniel 3:27 in English
Daniel 3:27 · Berean Standard Bible
and when the satraps, prefects, governors, and royal advisers had gathered around, they saw that the fire had no effect on the bodies of these men. Not a hair of their heads was singed, their robes were unaffected, and there was no smell of fire on them.
Context
25Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.” 26Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!”
Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta. 27Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha. 28Mgbe ahụ, Nebukadneza sịrị, “Otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak na Abednego nʼihi na o zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi, mgbe ha jụrụ ime ihe eze nyere nʼiwu, kama ha jiri aka ha họrọ ịnwụ, kama ife chi ọzọ nke na-abụghị Chineke nke ha. 29Ya mere, ana m enye iwu a taa, na-asị na onye ọbụla, maọbụ mba ọbụla, maọbụ asụsụ ọbụla, onye kwuru okwu ọjọọ megide Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-etikpọkwa ụlọ onye ahụ, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. Nʼihi na o nweghị chi ọzọ nke pụrụ ịzọpụta nʼụzọ dị otu a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.