Daniel 3:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.”
Daniel 3:25 in English
Daniel 3:25 · Berean Standard Bible
“Look!” he exclaimed. “I see four men, unbound and unharmed, walking around in the fire—and the fourth looks like a son of the gods!*”
Context
23Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike. 24Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?”
Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.” 25Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.” 26Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!”
Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta. 27Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.