Daniel 12:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ.
Daniel 12:5 in English
Daniel 12:5 · Berean Standard Bible
Then I, Daniel, looked and saw two others standing there, one on this bank of the river and one on the opposite bank.
Context
3Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi. 4Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.” 5Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ. 6Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?” 7Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.