Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?”

Daniel 12:6 in English

Daniel 12:6 · Berean Standard Bible

One of them said to the man dressed in linen, who was above the waters of the river, “How long until the fulfillment of these wonders?”

Context

4Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.” 5Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ. 6Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?” 7Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.” 8Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.