Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush* ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya.

Daniel 11:43 in English

Daniel 11:43 · Berean Standard Bible

He will gain control of the treasures of gold and silver and over all the riches of Egypt, and the Libyans and Cushites * will also submit to him.

Context

41Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya. 42Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya. 43Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush* ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya. 44Ma nʼoge a kwa, ozi ga-esi nʼọwụwa anyanwụ na nʼugwu bịa, nke ga-emenye ya egwu. Nʼihi ya, ọ ga-eji oke iwe pụọ ibibi ọtụtụ ndị ma laakwa ha nʼiyi. 45Ọ ga-akwụba ụlọeze ya nʼetiti ugwu ọma ahụ dị nsọ na nʼoke osimiri, nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka. 11:6 Akwụkwọ ochie na-ede nwa 11:17 Site nʼọlụlụ di na nwunye 11:43 Ya bụ, ndị Itiopia

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.