Ndị Kọlọsị 4:3
Colossians 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ,
Colossians 4:3 in English
Colossians 4:3 · Berean Standard Bible
as you pray also for us, that God may open to us a door for the word, so that we may proclaim the mystery of Christ, for which I am in chains.
Context
1Unu ndị nwe odibo, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na ikpe ziri ezi na-emeso ndị ohu unu omume, ebe unu maara na unu onwe unu nwere onyenwe unu nʼeluigwe. 2Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele. 3Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ, 4ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri. 5Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.