Emọs 7:8
Amos 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.
Amos 7:8 in English
Amos 7:8 · Berean Standard Bible
“Amos, what do you see?” asked the LORD. “A plumb line,” I replied. “Behold,” said the Lord, “I am setting a plumb line among My people Israel; I will no longer spare them:
Context
6Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.” 7Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya. 8Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?”
Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee. 9“Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi,
ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu,
aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.” 10Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.