Native Bible

Amos 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.

Amos 7:10 in English

Amos 7:10 · Berean Standard Bible

Then Amaziah the priest of Bethel sent word to Jeroboam king of Israel, saying, “Amos has conspired against you in the midst of the house of Israel. The land cannot bear all his words,

Context

8Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee. 9“Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.” 10Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta. 11Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị, “ ‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha, Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.’ ” 12Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.