Ọrụ Ndị Ozi 9:7
Acts 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla.
Acts 9:7 in English
Acts 9:7 · Berean Standard Bible
The men traveling with Saul stood there speechless. They heard the voice but did not see anyone.
Context
5Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?”
Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu. 6Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.” 7Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla. 8Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs. 9Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.