Ọrụ Ndị Ozi 8:34
Acts 8:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?”
Acts 8:34 in English
Acts 8:34 · Berean Standard Bible
“Tell me,” said the eunuch, “who is the prophet talking about, himself or someone else?”
Context
32Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a,
“E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya.
Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị,
otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya. 33Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka.
Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya?
Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.”* 34Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?” 35Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs. 36Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.