Ọrụ Ndị Ozi 8:32
Acts 8:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya.
Acts 8:32 in English
Acts 8:32 · Berean Standard Bible
The eunuch was reading this passage of Scripture: “He was led like a sheep to the slaughter, and as a lamb before the shearer is silent, so He did not open His mouth.
Context
30Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?” 31Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya. 32Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a,
“E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya.
Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị,
otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya. 33Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka.
Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya?
Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.”* 34Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.