Ọrụ Ndị Ozi 8:15
Acts 8:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ.
Acts 8:15 in English
Acts 8:15 · Berean Standard Bible
On their arrival, they prayed for them to receive the Holy Spirit.
Context
13Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu. 14Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn. 15Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ. 16Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. 17Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.