Ọrụ Ndị Ozi 4:24
Acts 4:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha.
Acts 4:24 in English
Acts 4:24 · Berean Standard Bible
When the believers heard this, they lifted up their voices to God with one accord. “Sovereign Lord,” they said, “You made the heaven and the earth and the sea and everything in them.
Context
22Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ. 23Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha. 24Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. 25Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị:
“ ‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ?
Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru? 26Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha,
ndị na-achị achị na-agbakọtakwa,
imegide Onyenwe anyị
na imegide Onye ya e tere mmanụ.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.