Ọrụ Ndị Ozi 28:27
Acts 28:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’*
Acts 28:27 in English
Acts 28:27 · Berean Standard Bible
For this people’s heart has grown callous; they hardly hear with their ears, and they have closed their eyes. Otherwise they might see with their eyes, hear with their ears, understand with their hearts, and turn, and I would heal them.’*
Context
25Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha, 26“ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu,
“Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla,
unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.” 27Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ;
ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe,
ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ.
Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,
jirikwa ntị ha nụ ihe
sitekwa nʼobi ha nwe nghọta
ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’* 28“Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.” 29Mgbe o kwusiri nke a, ndị Juu ahụ lara na-arụrịta ụka nke ukwu nʼetiti onwe ha.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.