Ọrụ Ndị Ozi 28:26
Acts 28:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.”
Acts 28:26 in English
Acts 28:26 · Berean Standard Bible
‘Go to this people and say, “You will be ever hearing but never understanding; you will be ever seeing but never perceiving.”
Context
24Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha. 25Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha, 26“ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu,
“Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla,
unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.” 27Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ;
ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe,
ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ.
Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,
jirikwa ntị ha nụ ihe
sitekwa nʼobi ha nwe nghọta
ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’* 28“Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.