Native Bible

Ọrụ Ndị Ozi 24:7

Igbo· Change

Acts 24:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.*

Context

5“Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret. 6Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị, 7ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.* 8Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.” 9Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.