Ọrụ Ndị Ozi 24:11
Acts 24:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.
Acts 24:11 in English
Acts 24:11 · Berean Standard Bible
You can verify for yourself that no more than twelve days ago I went up to Jerusalem to worship.
Context
9Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme. 10Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị. 11Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe. 12Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo. 13Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.