Ọrụ Ndị Ozi 23:24
Acts 23:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.”
Acts 23:24 in English
Acts 23:24 · Berean Standard Bible
Provide mounts for Paul to take him safely to Governor Felix.”
Context
22Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.” 23Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a. 24Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.” 25O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a: 26Klọdiọs Lisias,
Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a.
Ana m ekele gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.