Ọrụ Ndị Ozi 22:27
Acts 22:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Ọ sịrị, “E.”
Acts 22:27 in English
Acts 22:27 · Berean Standard Bible
The commander went to Paul and asked, “Tell me, are you a Roman citizen?” “Yes,” he answered.
Context
25Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?” 26Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.” 27Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?”
Ọ sịrị, “E.” 28Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.”
Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.” 29Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.