Native Bible

Acts 22:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.”

Acts 22:26 in English

Acts 22:26 · Berean Standard Bible

On hearing this, the centurion went and reported it to the commander. “What are you going to do?” he said. “This man is a Roman citizen.”

Context

24ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya. 25Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?” 26Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.” 27Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Ọ sịrị, “E.” 28Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.” Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.