Ọrụ Ndị Ozi 22:29
Acts 22:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
Acts 22:29 in English
Acts 22:29 · Berean Standard Bible
Then those who were about to interrogate Paul stepped back, and the commander himself was alarmed when he realized that he had put a Roman citizen in chains.
Context
27Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?”
Ọ sịrị, “E.” 28Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.”
Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.” 29Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ. 30Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.