Native Bible

Acts 21:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha.

Acts 21:6 in English

Acts 21:6 · Berean Standard Bible

And after we had said our farewells, we went aboard the ship, and they returned home.

Context

4Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem. 5Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere. 6Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha. 7Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị. 8Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.