Native Bible

Acts 21:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị.

Acts 21:7 in English

Acts 21:7 · Berean Standard Bible

When we had finished our voyage from Tyre, we landed at Ptolemais, where we greeted the brothers and stayed with them for a day.

Context

5Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere. 6Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha. 7Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị. 8Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ. 9O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.