Ọrụ Ndị Ozi 2:29
Acts 2:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa.
Acts 2:29 in English
Acts 2:29 · Berean Standard Bible
Brothers, I can tell you with confidence that the patriarch David died and was buried, and his tomb is with us to this day.
Context
27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ,
ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure. 28I mere ka m mara ụzọ nke ndụ;
ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’* 29“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa. 30Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya. 31Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.