Ọrụ Ndị Ozi 10:15
Acts 10:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.”
Acts 10:15 in English
Acts 10:15 · Berean Standard Bible
The voice spoke to him a second time: “Do not call anything impure that God has made clean.”
Context
13Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.” 14Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.” 15Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.” 16Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe. 17Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.