2 Samuel 8:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
2 Samuel 8:5 in English
2 Samuel 8:5 · Berean Standard Bible
When the Arameans of Damascus came to help King Hadadezer of Zobah, David struck down twenty-two thousand men.
Context
3Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis. 4Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya. 5Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha. 6O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 7Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.