Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.

2 Samuel 8:3 in English

2 Samuel 8:3 · Berean Standard Bible

David also defeated Hadadezer son of Rehob, king of Zobah, who had marched out to restore his dominion along the Euphrates River.*

Context

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia. 2Devid merikwara ndị Moab.* O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. 3Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis. 4Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya. 5Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.