2 Samuel 8:2
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid merikwara ndị Moab.* O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
2 Samuel 8:2 in English
2 Samuel 8:2 · Berean Standard Bible
David also defeated the Moabites, made them lie down on the ground, and measured them off with a cord. He measured off with two lengths those to be put to death, and with one length those to be spared. So the Moabites became subject to David and brought him tribute.
Context
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia. 2Devid merikwara ndị Moab.* O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. 3Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis. 4Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.