Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.

2 Samuel 8:15 in English

2 Samuel 8:15 · Berean Standard Bible

Thus David reigned over all Israel and administered justice and righteousness for all his people:

Context

13Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite. 14O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 15Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ. 16Onyeisi ndị agha ya bụ Joab* nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud. 17Zadọk* nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.